7 Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu nēme ka obi umu Israel ju igabiga ba n'ala ahu Jehova nyeworo ha?
8 Otú a ka nna-unu-hà mere, mb͕e m'siri n'ala Kedesh-banea ziga ha ihu ala ahu.
9 Ha we rigorue ndagwurugwu Eshkol, hu ala ahu, we me ka obi umu Israel si, É-è, si na ha agaghi-abà n'ala ahu nke Jehova nyere ha-ri.
10 Iwe Jehova we di ọku n'ubọchi ahu, Ọ we ṅua iyi, si,
11 Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:
12 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu.
13 Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we me ka ha nāṅaghari n'ọzara ọgu arọ abua, rue mb͕e ọb͕ọ ahu nile, nke nēme ihe ọjọ n'anya Jehova, gwusiri.