1 Ndia bu nbuli-ije umu Israel, ndi siri n'ala Ijipt puta, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, n'aka Moses na Eron.
2 Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di.
3 Ha we si na Rameses bulie ije n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa mbu ahu; n'echi nke ngabiga ahu ka umu Israel siri n'Ijipt puta n'aka di elu n'anya ndi Ijipt nile,
4 mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.
5 Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot.
6 Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara.
7 Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol.