34 Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona.
35 Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba.
36 Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).
37 Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.
38 Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu.
39 Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.
40 Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.