39 Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.
40 Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.
41 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.
42 Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.
43 Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
44 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab.
45 Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.