4 mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.
5 Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot.
6 Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara.
7 Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol.
8 Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara.
9 Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu.
10 Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie.