40 Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.
41 Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.
42 Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.
43 Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
44 Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab.
45 Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.
46 Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim.