45 Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.
46 Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim.
47 Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo.
48 Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko.
49 Ha ma ulo-ikwū-ha n'akuku Jọdan, site na Bet-jeshimot rue Ebel-shitim n'ala ihe nādighi nke Moab.
50 Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,
51 Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean,