9 Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu.
10 Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie.
11 Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin.
12 Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka.
13 Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush.
14 Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu.
15 Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai.