1 Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,)
3 akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:
4 ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon:
5 ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri.
6 Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu