32 na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.
33 Nka bu òfùfè nke ab͕uru nile nke umu Merari, dika òfùfè-ha nile si di, n'ulo-ikwū nzute, n'aka Itama nwa Eron, bú onye-nchu-àjà.
34 Moses na Eron na ndi-isi nzukọ Israel we gukọta umu ndi Kohat dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,
35 site n'onye b͕ara orú arọ na iri gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ifè òfùfè n'ulo-ikwū nzute:
36 ndi-ha agukọtara agukọta, dika ab͕uru nile ha si di, di nnù isi na ọgu iri-na-asa na iri.
37 Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke ab͕uru nile nke ndi Kohat, onye ọ bula nke nēfè òfùfè n'ulo-ikwū nzute, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
38 Ndi agukọtara agukọta nke umu Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, na dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,