1 Jehova we gwa Moses okwu, si,
2 Gwa umu Israel okwu, si ha, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ọ gālu oké ọlu n'ikwe nkwa onye-Nazirait, ikewaputara Jehova onwe-ya:
3 na manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ọ gēkewaputa onwe-ya; ọ gaghi-aṅu manya-vine b͕ara uka, ma-ọbu ihe- ọṅuṅu nābà n'anya b͕ara uka, ọ gaghi-aṅu kwa miri nkpuru-vine ọ bula, ọ gaghi-eri kwa nkpuru-vine ọhu ma-ọbu nke amikọrọ amikọ.
4 Ubọchi nile nke nkewaputa-ya ọ dighi ihe nime ihe ọ bula emere site n'osisi vine nke manya-vine o gēri, site na nkpuru-ime-ya we rue mb͕ub͕ọ-ya.