11 Onye-nchu-àjà gēme otù ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru àjà-nsure-ọku, o gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, n'ihi nmehie nke ọ mehiere site na madu ahu nwuru anwu, o gēdo kwa isi-ya nsọ n'ubọchi ahu.
12 Ọ gēkewaputa-kwa-ra Jehova ubọchi nile nke nkewaputa-ya, weta kwa nwa-ebulu b͕ara otù arọ ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma: ma ubọchi mbu nile alawo n'iyì, n'ihi na nkewaputa-ya ruru árú.
13 Nka bu kwa iwu onye-Nazirait, n'ubọchi ozùzù nke ubọchi nile nke nkewaputa-ya: agēme ka ọ bia n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute:
14 ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo,
15 na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.
16 Onye-nchu-àjà gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, me àjà-nmehie-ya, na àjà-nsure-ọku-ya:
17 ọ gēme kwa ebulu ahu ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo anāchuru Jehova, tiyere nkata achicha ekoghi-eko ahu: onye-nchu-àjà gēme kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.