1 Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si,
2 Ka umu Israel me kwa ememe ngabiga na mb͕e-ya akara àkà.
3 N'ubọchi nke-iri-na-anọ n'onwa nka, n'etiti ehihie na anyasi, ka unu gēme ya na mb͕e-ya akara àkà: dika ukpuru-ya nile si di, na dika ikpé-ya nile si di, ka unu gēme ya.
4 Moses we gwa umu Israel okwu, si ha me ememe ngabiga ahu.