7 Achicha ekoghi-eko ka agēri n'ubọchi asa ahu; agaghi-ahu kwa achicha koro eko n'aka-gi, agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile.
8 I gēgosi kwa nwa-gi n'ubọchi ahu, si, Ọ bu n'ihi ihe ahu Jehova merem mb͕e m'siri n'Ijipt puta.
9 Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta.
10 I gēdebe kwa ukpuru a na mb͕e-ya akara àkà kwa-arọ.
11 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme ka i ba n'ala ndi Kenean, dika Ọ ṅuru gi na nna-gi-hà iyi, mb͕e Ọ gēnye kwa gi ya,
12 na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe.
13 Ma nwa ọ bula nke inyinya-ibu nke meghere àkpà-nwa, i gēwere nwa-aturu b͕aputa ya; ma ọ buru na i b͕aputaghi ya, i gāb͕aji kwa olu-ya: ọkpara ọ bula nke madu n'etiti umu-gi ka i gab͕aputa kwa.