11 Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.
12 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke.
13 O rue, n'echi-ya, na Moses nọduru ala ikpe ndi Israel ikpe: ndi ahu we guzo n'akuku Moses si n'ututu rue anyasi.
14 Nna nwunye Moses we hu ihe nile nke Moses onwe-ya nēme ndi Israel, ọ we si, Gini bu ihe a nke gi onwe-gi nēme ndi nka? gini mere gi onwe-gi nānọdu ala nání gi iche, ma ndi nka nile nēguzo onwe-ha n'akuku gi si n'ututu rue anyasi?
15 Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase:
16 mb͕e ha nwere okwu, ha abiakutem; m'nēkpe kwa ikpe n'etiti madu na ibe-ya, m'nēme kwa ka ha mara ukpuru nile nke Chineke, na iwu-Ya nile.
17 Nna nwunye Moses we si ya, Ọ dighi nma, bú ihe gi onwe-gi nēme.