21 Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:
22 ka ha kpe ndi nka na mb͕e nile: o gēru, na oké okwu nile ọ bula ka ha gēwetara gi, ma ha onwe-ha gēkpe okwu ntà nile ọ bula: gi me ka ọ di kari nfe n'aru gi, ha gēso kwa gi buru ibu a.
23 Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo.
24 Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri.
25 Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.
26 Ha we kpe ndi Israel ikpe na mb͕e nile: okwu nile nke siri ike ka ha nēwetara Moses, ma ha onwe-ha nēkpe okwu ntà nile.
27 Moses we zipu nna nwunye-ya; o we je nke ya, la n'ala-ya.