13 ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a.
14 Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha.
15 Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.
16 O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.
17 Moses we me ka ndi Israel si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha puta izute Chineke, ha we guzo onwe-ha n'ala-ala nke ugwu ahu.
18 Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.
19 Olu opì-ike ahu we nādasi ike nke-uku, Moses nēkwu okwu, Chineke were kwa olu nāza ya.