2 Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ.
3 Ọ pughi kwa izobe ya ọzọ, ọ we meere ya ub͕ọ papyrus, were kwa bitumen na pitch te ya; o we tiye nwa ahu nime ya, tiye ya n'etiti ami n'usọ osimiri Nail.
4 Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya.
5 Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya.
6 O we meghe ya, hu nwa ahu, ma, le, ọ bu nwata-nwoke nākwa ákwá. O we nwe ọmiko n'aru ya, si, Otù nime umu ndi-Hibru ka nka bu.
7 Nwa-nne-ya nwayi we si nwa-nwayi Fero, #M'gēje kpọrọ gi nwayi nēnye nwa ara site na ndinyom Hibru, ka ọ we nyere gi nwa nka ara?
8 Nwa-nwayi Fero we si ya, Je. Nwa-ab͕ọghọ ahu we je kpọ nne nwa ahu.