19 Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.
20 Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu: n'ihi na ọ bu inwa unu ka Chineke biaworo, ya na ka egwù-Ya we di n'iru unu, ka unu we ghara imehie.
21 Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.
22 Jehova we si Moses, Otú a ka i gāsi umu Israel, Unu onwe-unu ahuwo na esiwom n'elu-igwe kpayere unu uka.
23 Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha.
24 Ebe-ichu-àjà nke ájá ka i gēmerem, chu kwa àjà-nsure-ọku-gi nile na àjà-udo-gi nile n'elu ya, bú ìgwè ewu na aturu-gi, na ìgwè ehi-gi: n'ebe nile ọ bula ebe M'nēme ka echeta aham, n'ebe ahu ka M'gābiakute gi, gọzi kwa gi.
25 Ma ọ buru na ebe-ichu-àjà nke nkume ka i gēmerem, ewerela nkume awara awa wu ya: n'ihi na asi na i mewo ka ihe-ọlu-gi ga n'elu ya, i we me ka ọ ghara idi nsọ.