25 ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.
26 Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.
27 Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya.
28 Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi.
29 Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua.
30 Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di.
31 Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.