1 Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu.
2 Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.
3 Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.
4 Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.
5 Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n'ubi ma-ọbu n'ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n'ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi.