4 Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.
5 Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n'ubi ma-ọbu n'ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n'ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi.
6 Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.
7 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.
8 Ọ buru na achọtaghi onye-ori ahu, onye-nwe ulo ahu gābiakute Chineke nso, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe madu-ibe-ya jetara n'ozi.
9 Okwu bayere ihe-njehie ọ bula, ma ọ bu okwu bayere ehi, bayere inyinya-ibu, bayere aturu, bayere uwe-nb͕okwasi, bayere ihe ọ bula furu efu, nke madu nāsi, Nka bu ya, Chineke ka okwu ha abua gābiakute; onye Chineke gāma ikpe, ọ gākwughachi ibe-ya okpukpu abua.
10 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya inyinya-ibu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu anumanu ọ bula, idebe: o we nwua, ma-ọbu ihe meruru ya aru, ma-ọbu adọta ya n'agha, ma ọ dighi onye nāhu ya: