1 Gi eburula akukọ efu: esola onye nēmebi iwu tiye aka-gi ibu onye-àmà nke ihe-ike.
2 Esola ọtutu madu n'azu ba n'ihe ọjọ di iche iche: ab͕a-kwa-la àmà bayere ise-okwu ka i we wezuga onwe-gi iso ọtutu madu n'azu iwezuga ikpé:
3 asọpuru-kwa-la onye nēnweghi ike n'ise-okwu-ya.
4 Mb͕e i zute ehi onye-iro-gi, ma-ọbu inyinya-ibu-ya, ka ọ nākpafu, i ghaghi ime ka ọ laghachikuru ya.
5 Mb͕e i huru inyinya-ibu nke onye nākpọ gi asì ka ibu-ya nānyib͕u ya, ma i nāchọ ighara itọpuru ya ibu ahu, i ghaghi iyere ya aka itọpu ya.
6 Ewezugala ikpé nke ob͕eye-gi n'ise-okwu-ya.
7 I gānọpuru okwu-ugha n'ebe di anya; eb͕u-kwa-la onye ikpé nāmaghi na onye ezi omume: n'ihi na adighm-agu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume.