32 Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya.
33 I gēme kwa n'ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n'ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n'etiti ha buruburu.
34 Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu.
35 Ọ gādi kwa n'aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ n'iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu.
36 I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.
37 I gātukwasi ya n'eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n'ákwà-nkukù-isi ahu; n'iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi.
38 Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.