19 iko atọ emere dika ifuru osisi almond di n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa.
20 iko anọ emere dika ifuru osisi almond di kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:
21 otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi di kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi nime ya waputa.
22 Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.
23 O me-kwa-ra oriọna-ya, ha di asa, na nkpa-ya nile, na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.
24 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka o ji me ya, ya na ihe-ya nile.
25 O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, osisi acacia ka ọ bu: otù cubit ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di kwa, ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ bu; cubit abua ka idi-elu-ya di kwa; mpi-ya nile sitere na ya.