17 Umu-ndikom Giashon; Libni, na Shimai, dika ab͕uru nile ha si di.
18 Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ.
19 Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di.
20 Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.
21 Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri.
22 Umu-ndikom Uziel kwa; Mishael, na Elzafan, na Sitri.
23 Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.