5 Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt.
6 Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.
7 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt.
8 Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n'ebe m'nọ, na n'ebe ndim nọ; m'gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà.
9 Moses we si Fero, Nya isi n'arum: òle mb͕e ka m'gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n'ebe i nọ na n'ebe ulo-gi nile di? nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu.
10 Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi.
11 Awọ gēwezuga onwe-ha n'ebe i nọ, na n'ebe ulo-gi nile di, na n'ebe ndi-orù-gi nọ, na n'ebe ndi-gi nọ; nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu.