6 Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.
7 Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.
8 Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero.
9 Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile.
10 Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.
11 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.
12 Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.