36 Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.
37 N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.
38 Mb͕e ahu ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi zara Ya, si, Onye-ozizí, ayi nāchọ ihu ihe-iriba-ama site n'aka-Gi.
39 Ma Ọ zara, si ha, Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona onye-amuma:
40 n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.
41 Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.
42 Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n'ebe a.