25 Baptism nke Jọn, òle ebe o si puta? ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi ayi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?
26 Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n'ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma.
27 Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Ọ si-kwa-ra ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.
28 Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem.
29 Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je.
30 O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi.
31 Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke.