10 ma-ọbu asi na ọ gāriọ azù, gēnye ya agwọ?
11 Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?
12 Ya mere ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu: n'ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.
13 Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.
14 N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.
15 Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.
16 Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké?