17 Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya.
18 M'we nye unu n'iwu na mb͕e ahu ihe nile unu gēme.
19 Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n'uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea.
20 M'we si unu, Unu abiaruwo ugwu ndi-Amorait, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.
21 Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n'iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.
22 Unu we biaruem nso, unu nile, si, Ka ayi zìe ndikom n'iru ayi, ka ha we leputara ayi ala ahu, weghachi-kwa-ra ayi okwu bayere uzọ nke ayi gēsi rigo, na obodo nke ayi gābà nime ha.
23 Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo: