18 Unu gēdo kwa okwu ndia n'obi-unu na nime nkpuru-obi-unu; unu gēke kwa ha n'elu aka-unu ka ha buru ihe-iriba-ama, ha gābu kwa nkpọ-n'iru n'etiti anya-unu.
19 Unu gēzí umu-unu ha, n'ikwu okwu bayere ha mb͕e i nānọdu n'ulo-gi, na mb͕e i nēje ije n'uzọ, na mb͕e i nēdina ala, na mb͕e i nēbili ọtọ.
20 I gēdekwasi kwa ha n'awara-uzọ abua nke ulo-gi, na n'ọnu-uzọ-ama-gi nile:
21 ka ubọchi-unu we ba uba, ha na ubọchi umu-unu, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, dika ubọchi elu-igwe nke di n'elu uwa.
22 N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;
23 Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.
24 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.