22 N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;
23 Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.
24 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.
25 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.
26 Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha;
27 ngọzi ahu, ma asi na unu ege nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta:
28 ma nkọcha ahu, ma ọ buru na unu egeghi nti ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, ma unu ewezuga onwe-unu n'uzọ ahu nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ka unu we jeso chi di iche iche ọzọ, nke unu nāmaghi.