27 i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.
28 Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.
29 Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēbipu mba nile n'iru gi, ebe i nābà nime inweta ha, i we nweta ha, biri n'ala-ha;
30 gi lezie onwe-gi anya ka aghara ima gi n'ọnyà iso ha n'azu, mb͕e ekpochapusiri ha n'iru gi; ka i ghara kwa iju ajuju bayere chi nile ha, si, Mba ndia si aṅa nēfè chi nile ha òfùfè? m'gēme kwa otú a, ọbuná mu onwem.
31 Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.
32 Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.