1 Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n'ihi na ọ bu n'ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n'Ijipt puta n'abali.
2 I gāchu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà ngabiga, nke ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'ebe ahu nke Jehova gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.
3 Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.
4 Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu.
5 I pughi ichu àjà ngabiga n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi:
6 kama n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n'ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n'anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n'Ijipt puta.
7 I gēsi kwa ya rie ya n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n'ututu, je n'ulo-ikwu-gi nile.