3 Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.
4 Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu.
5 I pughi ichu àjà ngabiga n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi:
6 kama n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri nime ya, n'ebe ahu ka i gāchu àjà ngabiga n'anyasi, mb͕e anyanwu nāda, na mb͕e akara àkà mb͕e i siri n'Ijipt puta.
7 I gēsi kwa ya rie ya n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa: i gēchighari kwa n'ututu, je n'ulo-ikwu-gi nile.
8 Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya.
9 Izù asa nke ubọchi asa ka i gāguru onwe-gi: site na mb͕e i nāmalite itiye mma-iwe-ihe-ubi nime ọka guzoro eguzo ka i gāmalite igu izù asa nke ubọchi asa.