8 Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n'ikpé, n'etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n'etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n'etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa;
9 i gābiakute kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, biakute kwa onye-ikpe nke gānọ na mb͕e ahu: i gāju kwa ase; ha gēgosi kwa gi uzọ ikpe ikpe ahu:
10 i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n'ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi:
11 dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.
12 Ma nwoke ahu nke nēme nganga, n'egeghi nti onye-nchu-àjà ahu nke nēguzo ije ozi n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ma-ọbu n'egeghi nti onye-ikpe ahu, nwoke ahu gānwu kwa: i gēkpochapu kwa ihe ọjọ ahu n'Israel.
13 Ndi Israel nile gānu kwa, tu kwa egwu, we ghara ime nganga ọzọ.
14 Mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, i we nweta ya, biri nime ya, si, M'gēdo eze ka ọ buru ezem, dika mba nile si eme ndi dim buruburu;