15 Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.
16 Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,
17 na Jehova gwaram okwu, si,
18 Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta:
19 ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta.
20 (Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;
21 ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha: