5 unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.
6 Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua.
7 N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.
8 Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba.Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab.
9 Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta.
10 (Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak;
11 Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.