1 I gaghi-ahu ehi nwa-nne-gi, ma-ọbu aturu-ya, nke nāchọ ifu efu, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi iwere ha nyeghachi nwa-nne-gi.
2 Ma ọ buru na nwa-nne-gi anọghi gi nso, ọ buru kwa na i maghi ya, i gēwebata kwa ya n'etiti ulo-gi, ọ gādi kwa n'aka-gi rue mb͕e nwa-nne-gi gāju ase ya, i we were ya nyeghachi ya.
3 Otú a ka i gēme-kwa-ra inyinya-ibu-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra uwe-nb͕okwasi-ya; otú a ka i gēme-kwa-ra ihe ọ bula furu efu nke nwa-nne-gi, nke nēfunari ya, ma i hutawo ya: i pughi izo onwe-gi.
4 I gaghi-ahu inyinya-ibu nwa-nne-gi ma-ọbu ehi-ya ka ha nāda n'uzọ, we zopu onwe-gi n'ebe ha di: i ghaghi isoro ya ibuli ha elu.
5 Ihe diri nwoke agaghi-adikwasi n'aru nwayi, nwoke agaghi-eyiri kwa uwe-nb͕okwasi nwayi: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka onye ọ bula bu nke nēme ihe ndia.