21 ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
22 Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel.
23 Mb͕e nwa-ab͕ọghọ di nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke kwere ilu, ma nwoke hutara ya n'obodo, we soro ya dina;
24 unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.
25 Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n'ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n'ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu:
26 ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n'ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di:
27 n'ihi na n'ọhia ka ọ hutara ya; nwa-ab͕ọghọ ahu nwoke kwere ilu tiri nkpu, ma ọ dighi onye-nzọputa o nwere.