25 Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n'ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n'ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu:
26 ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n'ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di:
27 n'ihi na n'ọhia ka ọ hutara ya; nwa-ab͕ọghọ ahu nwoke kwere ilu tiri nkpu, ma ọ dighi onye-nzọputa o nwere.
28 Mb͕e nwoke gāhuta nwa-ab͕ọghọ nke bu nwayi nāmaghi nwoke, nke nwoke nēkweghi ilu, o we jide ya, soro ya dina, ewe huta ha;
29 nwoke ahu nke soro ya dina gēnye kwa nna nwa-ab͕ọghọ ahu ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri, ya ka nwa-ab͕ọghọ ahu gābu-kwa-ra nwunye, n'ihi na o wedawo ya n'ala; ọ pughi ichupu ya ubọchi-ya nile.
30 Nwoke agaghi-ekuru nwunye nna-ya, ọ gaghi-ekpughe kwa uwe kpuchiri ọtọ nna-ya.