7 Ma ọ buru na ọ tọghi nwoke ahu iluru nwunye nwa-nne-ya na nwunye, nwunye nwa-nne-ya gārigoru ọnu-uzọ-ama, jekuru ndi-okenye, si, Nwa-nne dim nāju ime ka aha biliere nwa-nne-ya n'Israel, o kweghi ilu ọlu kwesiri nwa-nne di n'ebe m'nọ.
8 Ndi-okenye obodo-ya gākpọ kwa ya, gwa ya okwu: ma asi na o guzo, si, Ọ tọghm iluru ya na nwunye;
9 nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya.
10 Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya.
11 Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:
12 i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.
13 Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.