9 nwunye nwa-nne-ya gābiaru ya nso n'anya ndi-okenye, tọpu akpukpọ-ukwu-ya n'ukwu-ya, b͕asa ya asọ n'iru, za ya, si, Otú a ka agēme nwoke ahu nke nēwulighi ulo nwa-nne-ya.
10 Agākpọ kwa aha-ya n'Israel, Ulo nke onye atọpuru akpukpọ-ukwu-ya.
11 Mb͕e ndikom gālurita ọ̀gù, otù onye na ibe-ya, ma nwunye nke otù nime ha abiaru nso inaputa di-ya n'aka onye nēti ya ihe, asi na ọ setipu aka-ya, we jide ya na nkpa-amu-ya:
12 i gēbipu kwa aka-ya, anya-gi agaghi-eme ebere.
13 Enwela n'àkpà-gi uzọ nkume-isì-ihe abua, nke-uku na nke-ntà.
14 Enwela n'ulo-gi uzọ ephah abua, nke-uku na nke-ntà.
15 Nkume-isì-ihe zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe; ephah zuru okè, nke zi-kwa-ra ezi, ka i gēnwe: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.