5 I gēwu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú ebe-ichu-àjà nkume: emela ka ihe-ọlu ígwè ga n'elu ha.
6 I gēji nkume zuru okè wue ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: i gēsure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà-nsure-ọku n'elu ya:
7 i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi.
8 I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.
9 Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.
10 I gēge kwa nti olu Jehova, bú Chineke-gi, me ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.
11 Moses we nye ndi Israel iwu n'ubọchi ahu, si,