25 Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.
26 Ozu-gi gābu-kwa-ra anu-ufe nile nke elu-igwe, bu-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri, onye-nchuli adighi kwa.
27 Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya.
28 Jehova gēwere ara-ọwiwi, were kwa ikpu-ìsì, were kwa ihe ngbu nke obi, tib͕ue gi:
29 i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.
30 I gēkwe nkwa ilu nwunye, ma ya na nwoke ọzọ gēdina: i gēwu ulo, ma i gaghi-ebi nime ya: i gāku ubi-vine, ma i gaghi-eme ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.
31 Agēb͕u ehi-gi n'anya-gi, ma i gaghi-eri nime anu-ya: agānapu gi inyinya-ibu-gi n'iru gi, ma agaghi-eweghachiri gi ya: agēnye ndi-iro-gi ìgwè ewu na aturu-gi, ma i gaghi-enwe onye-nzọputa.