8 Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.
9 Moses we de iwu a n'akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel.
10 Moses we nye ha iwu, si, N'ọgwugwu arọ asa, na mb͕e akara àkà nke arọ nrapu ahu, n'ememe ulo-ntu,
11 mb͕e Israel nile gābia ka ahu ha anya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa, i gāgu iwu a n'iru Israel nile na nti-ha.
12 Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a;
13 umu-ha, ndi nāmaghi, gānu kwa, we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ebe unu nāgabiga Jọdan inweta ya.
14 Jehova we si Moses, Le, ubọchi-i gānwu nābiaru nso: kpọ Joshua, guzo-kwa-nu onwe-unu n'ulo-ikwū nzute, ka M'we nye ya iwu. Moses na Joshua we je, guzo onwe-ha n'ulo-ikwū nzute.