1 Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe;Ka uwa nu kwa okwu ọnum:
2 Nmutam gātasi dika miri-ozuzo,Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi;Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu,Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú:
3 N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa:Nyenu Chineke-ayi idi-uku.
4 Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu:N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi:Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume,Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.
5 Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu.Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ.
6 Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a,Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe?Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi?Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike.
7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga,Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ:Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi;Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.