24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo,Ya na nbipu di ilu;Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha,Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.
25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí,Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile;Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke,Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.
26 Asiwom, M'gāfupu ha,Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:
27 Ma ọ buru na atughm ujọ nkpasu-iwe onye-iro,Ka ndi nākpab͕u ha we ghara ichehie,Ka ha we ghara isi, Aka-ayi di elu,Ọ bughi Jehova meworo ihe a nile.
28 N'ihi na mba nke furu efu n'ebe idu-ọdu di ka ha bu,Nghọta adighi kwa nime ha.
29 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ha mara ihe, nwe kwa uche na nka,Ma asi na ha gāghọta ikpe-azu-ha!
30 Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri,Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga,Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha,Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?